Romans 11

A ga-azọpụta ole na ole

1Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta. 2Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel? 3“Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.” 4Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.” b 5Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya. 6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.

7Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha. 8Dịka e dere ya,

“Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe.
O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ,
nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe;
o mere nke a ruo taa.”
9Devid kwukwara,

“Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya,
ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha.
10Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ.
Mee ka azụ ha bụrụ ihe arọjiri arọji ruo mgbe ebighị ebi.”

A ga-azọpụta ndị Juu

11Ajụjụ ọzọ m na-ajụ bụ nke a: Ọ ga-abụ na ha sụrụ ngọngọ ka ha daa ma ghara ibilite ọzọ? Ọ bụghị otu a! Kama nʼihi mmehie ha, nzọpụta rutere ndị mba ọzọ ka e sitekwa na nke a kpalie ekworo nʼime ụmụ Izrel. 12Ma ọ bụrụ na mmehie ha wetara akụnụba nye ụwa, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye ha wetara ngọzị nye ndị mba ọzọ, ọ bụ na ngọzị babigara ụba oke agaghị adị mgbe a ga-agụkọta ọnụọgụgụ ha niile?

13Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m. 14Nʼihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nʼụzọ a kpasuo ekworo nʼime ụfọdụ ụmụnna m, ka e site nʼekworo ha zọpụta ụfọdụ nʼime ha. 15Ọ bụrụ na ọ bụ site nʼọjụjụ a jụrụ ha ka e siri mee ka ụwa dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ ga-adị ka i si nʼọnwụ bilie ọzọ, nwee ndụ ọzọ. 16Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ.

Ịdọ aka na ntị

17Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ. 18Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu. 19Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo, “Ma a nyakapụrụ alaka ụfọdụ e nwee ohere ebe a ga-anyapagide anyị.” 20Nke ahụ bụ eziokwu. Ma chetakwanụ na a nyakapụrụ ha nʼihi ekweghị ekwe ha, ma unu nọ naanị site nʼokwukwe. Ya mere anyala isi, kama na-atụ egwu. 21Nʼihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nʼonwe ya ebere, ọ gaghị emekwara gị ebere.

22Ya mere, tulee obiọma na aka ike Chineke, aka ike nʼebe ndị dara ada nọ, ma obiọma nʼebe unu nọ, naanị mgbe unu na-anọgideghị nʼobi ebere ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anyakapụkwa unu. 23Ma ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ekweghị ekwe, a ga-anyapagidekwa ha nʼihi na Chineke pụrụ ịnyapagide ha ọzọ. 24Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha.

Nzube Chineke banyere ndị Izrel

25Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru. 26Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya,

“Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa.
Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa.
27Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,
mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.”
28Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha. 29Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke. 30Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha. 31Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu. 32Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya.

Ekele dịrị Chineke

33Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu!
Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile,
ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.
34“Onye maara uche Onyenwe anyị?
Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?” f
35“Onye burula ụzọ nye Chineke ihe,
nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?” g
36Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya.
Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.
Copyright information for IboBIU